Nehemiah 7

1Mgbe e wuzichara mgbidi ahụ, na mgbe m guzobesịrị ibo nʼọnụ ụzọ ya niile nʼọnọdụ ha, họpụtakwa ndị ọbụ abụ na ndị nche, na ndị Livayị. 2Enyefere m ọrụ ilekọta Jerusalem nʼaka nwanne m nwoke bụ Hanani, ya na Hananaya onye bụ onyeisi ụlọ ukwu ahụ e wusiri ike, nʼihi na ọ bụ nwoke na-ekwu eziokwu, bụrụkwa onye na-atụ egwu Chineke karịa ọtụtụ ndị ọzọ. 3Agwara m ha, “Na-emeghenụ ọnụ ụzọ ama naanị mgbe chi bọziri nke ọma. Kpọchiekwa ha mgbe ndị nche ka nọ na nche. Họpụtakwanụ ndị bi na Jerusalem ka ha bụrụ ndị nche. Ụfọdụ ga-eche nʼebe a họpụtara ha, ụfọdụ ga-eche nʼakụkụ ụlọ nke aka ha.”

Ọnụọgụgụ ndị lọtara

4Nʼoge a obodo ahụ buru ibu dịkwa mbara, ma ndị bi nʼime ya dị ole na ole nʼọnụọgụgụ, ụlọ ndị dị nʼime ya bụkwa ihe ewugharịbeghị. 5Ya mere Chineke m tinyere ya nʼobi m ka m chịkọta ndị niile a na-asọpụrụ, ndị ọchịchị, na ndị niile bi nʼobodo, maka idebanye aha nʼakwụkwọ ezinaụlọ nʼezinaụlọ. Achọtara m ebe e depụtara usoro ndị mmadụ niile bụ ụzọ lọta Juda nʼoge gara aga. Nke a bụ ihe m chọpụtara edere nʼime ya:

6Ndị a bụ ndị obodo niile a na-achị achị, bụ ndị sitere na ndọta nʼagha nke Nebukadneza, eze Babilọn, onye dọtara ha nʼagha buru ha laa nʼala ọzọ. Ha lọghachitere na Jerusalem nakwa Juda, onye ọbụla nʼobodo nke aka ya. 7Ndịisi ha na Zerubabel soo, bụ Jeshua, Nehemaya, Azaraya, Raamaya, Nahamani, Mọdekai, Bilshan, Misperet, Bigvai, Nehum na Baana.

Ihe ndepụta ọnụọgụgụ ndị ikom Izrel bụ nke a:
8Ndị agbụrụ Parosh, puku abụọ, otu narị na iri asaa na abụọ (2,172),
9nke Shefataya, narị atọ na iri asaa na abụọ (372),
10nke Ara, narị isii na iri ise na abụọ (652),
11nke Pahat-Moab site nʼụmụ Jeshua na Joab, puku abụọ, na narị asatọ na iri na asatọ (2,818),
12nke Elam, otu puku, na narị abụọ na iri ise na anọ (1,254),
13nke Zatu, narị asatọ na iri anọ na ise (845),
14nke Zakai, narị asaa na iri isii (760),
15nke Binui, narị isii na iri anọ na asatọ (648),
16nke Bebai, narị isii na iri abụọ na asatọ (628),
17nke Azgad, puku abụọ, na narị atọ na iri abụọ na abụọ (2,322),
18nke Adonikam, narị isii na iri isii na asaa (667),
19nke Bigvai, puku abụọ, na iri isii na asaa (2,067),
20nke Adin, narị isii na iri ise na ise (655),
21nke Atea (site na Hezekaya), iri itoolu na asatọ (98),
22nke Hashum, narị atọ na iri atọ na asatọ (328),
23nke Bezai, narị atọ na iri abụọ na anọ (324),
24nke Harif, otu narị na iri na abụọ (112),
25nke Gibiọn, iri itoolu na ise (95).
26Ndị ikom Betlehem na Netofa, otu narị na iri asatọ na asatọ (188),
27ndị Anatot, otu narị na iri abụọ na asatọ (128),
28ndị Bet-Azmavet, iri anọ na abụọ (42),
29ndị Kiriat Jearim, Kefira na Beerọt, narị asaa na iri anọ na atọ (743),
30ndị Rema na Geba, narị isii na iri abụọ na otu (621),
31ndị Mikmash, otu narị na iri abụọ na abụọ (122),
32ndị Betel na Ai, otu narị na iri abụọ na atọ (123),
33ndị Nebo nke ọzọ, iri ise na abụọ (52),
34ndị agbụrụ Elam nke ọzọ, otu puku, narị abụọ na iri ise na anọ (1,254),
35ndị Harim, narị atọ na iri abụọ (320),
36ndị Jeriko, narị atọ na iri anọ na ise (345),
37ndị Lod, Hadid, na Ono, narị asaa na iri abụọ na otu (721),
38ndị Senaa, puku atọ, na narị itoolu na iri atọ (3,930).

39Ndị nchụaja:
ndị agbụrụ Jedaya site nʼezinaụlọ Jeshua, narị itoolu na iri asaa na atọ (973),
40ndị Imea, otu puku, na iri ise na abụọ (1,052),
41ndị Pashua, otu puku, na narị abụọ na iri anọ na asaa (1,247),
42ndị Harim, otu puku, na iri na asaa (1,017).

43Ndị Livayị:
ndị agbụrụ Jeshua site na Kadmiel nke ụmụ Hodavaya, iri asaa na anọ (74).

44Ndị ọbụ abụ:
ndị agbụrụ Asaf, otu narị, na iri anọ na asatọ (148).

45Ndị nche ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu:
ndị agbụrụ Shalum, Atea, Talmon, Akub, Hatita na Shobai otu narị, na iri atọ na asatọ (138).

46Ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ:
ndị agbụrụ Ziha, Hasufa na ndị Tabaot,
47Keros, Sia, Padon,
48Lebana, Hagaba, Shalmai,
49Hanan, Gidel, Gaha,
50Reaya, Rezin, Nekoda,
51Gazam, Ụza, Pasea,
52Besai, Meunim, Nefusim,
53Bakbuk, Hakufa, Hahua,
54Bazlut, Mehida, Hasha,
55Bakos, Sisera, Tema,
56Nezaya na Hatifa.
57Agbụrụ ndị na-ejere eze Solomọn ozi,
ya bụ ndị agbụrụ Sotai, Soferat, Perida,
58Jaala, Dakon, Gidel,
59Shefataya, Hatil,
Pokeret-Hazebaim na Amọn.
60Ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ na ụmụ ndị na-ejere eze Solomọn ozi, dị narị atọ na iri itoolu na abụọ (392).

61Ndị a bụ ndị ọzọ sitere nʼobodo Tel Mela, Tel Hasha, Kerub, Adọn na Imea, nke dị nʼala Peshịa lọta. Ma ha enweghị ike igosi ezinaụlọ ebe agbụrụ ha si nʼIzrel.
62Ndị agbụrụ:
Delaya, ndị Tobaya na ndị Nekoda, narị isii na iri anọ na abụọ (642).

63Sitekwa nʼetiti ndị nchụaja:
Ndị agbụrụ:
Hobaya, Hakoz na Bazilai (nwoke lụrụ ada Bazilai onye Gilead a kpọọ ya aha nʼaha ha).
64Ndị a chọrọ ebe e depụtara usoro ọmụmụ ha nʼakwụkwọ, ma ha achọtaghị ha nʼihi ya e wepụrụ ha nʼọrụ nchụaja dịka ndị na-adịghị ọcha. 65Nʼihi nke a, onyeisi ọchịchị nyere iwu ka ha ghara iri ihe aja dịkarịsịrị nsọ, tutu ruo mgbe a ga-enwe onye nchụaja na-eji Urim na Tumim ajụta ase.

66Nkpọkọta ọnụọgụgụ ndị niile lọtara dị iri puku anọ na abụọ, na narị atọ na iri isii (42,360), 67nke a agụnyeghị ndị ohu ndị ikom na ndị inyom dị puku asaa, na narị atọ na iri atọ na asaa (7,337), ndị ikom na ndị inyom, ndị ọbụ abụ
Tinyere ndị Livayị na-abụ abụ, e nwere ọtụtụ ndị ọzọ na-abụ abụ nʼoge mmemme dị iche iche, dịka nʼoge ọlụlụ nwanyị, na nʼoge olili na ọnwụ Ezr 2:65
dị narị abụọ, na iri anọ na ise (245).
68Ịnyịnya dị narị asaa na iri atọ na isii (736), ịnyịnya muul narị abụọ na iri anọ na ise (245), 69ịnyịnya kamel dị narị anọ na iri atọ na ise (435), ebe ịnyịnya ibu dị puku isii, na narị asaa na iri abụọ (6,720).

70Ma ụfọdụ nʼime ndịisi ezinaụlọ nyere onyinye maka ọrụ ahụ. Onyeisi ọchịchị tinyere nʼụlọakụ otu puku darik ọlaedo (1,000),
Ya bụ kilogram asatọ na ụma anọ
iri efere ọlaedo ise (50) na uwe ndị nchụaja narị ise na iri atọ (530).
71Ụfọdụ ndịisi ezinaụlọ tinyere nʼụlọakụ maka ije ozi ahụ, darik ọlaedo puku iri abụọ (20,000),
Darik ịdị arọ ya ruru narị kilogram na iri kilogram asaa
na ọtụtụ minas ọlaọcha puku abụọ na narị abụọ (2,200).
Ịdị arọ ya ruru otu tọọnu na ụma abụọ
72Nkpọkọta ọnụọgụgụ nke ndị mmadụ fọdụrụ nyere bụ, darik ọlaedo puku iri abụọ (20,000), na minas ọlaọcha puku abụọ (2,000), na uwe ndị nchụaja iri isii na asaa (67).

73Ndị nchụaja, na ndị Livayị, na ndị nche ọnụ ụzọ, ndị ọbụ abụ na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ, tinyere ụfọdụ ndị mmadụ na ndị Izrel niile fọdụrụ, gara birikwa nʼobodo nke ha.

Ezra agụọ site nʼakwụkwọ iwu

Mgbe ọnwa asaa ruru, nʼoge a ndị Izrel niile e birila nʼobodo nke aka ha,

Copyright information for IboBIU